Akụkọ Eziokwu nke Jizọs
Lelee Akụkọ Eziokwu nke Jizọs
Gaa n’Ibe Ahụ
Ndị kpeere ekpere
Ọ bụrụ na ị kpere ekpere nke nzọpụta ị bụ nwa Chineke ugbu a.
“Ma ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” kwerekwa nʼime obi gị na Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ, a ga-azọpụta gị.”—Rom 10:9
Ị nwere ike iso anyị kpee ekpere ugbu a maka nzọpụta gị:
Ezigbo Chineke,
Ana m ekwupụta na Jizọs bụ Onyenwe m. Ekwere m na a mụrụ Ya site n’aka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, na Ọ nwụrụ n’obe n’ihi mmehie m, ma bilie n’ọnwụ n’ụbọchị nke atọ. Taa, a na m ekwupụta na emehiela m megide Gị, na enweghikwa m ike ịzọpụta onwe m. A na m arịọ Gị ka I gbaghara m, ma tinye ntụkwasị obi m n’ime Jizọs naanị Ya. Ekwere m na ugbu a abụ m nwa Gị, na mu na Gị ga-anọ rue mgbe ebighị ebi. Were Mmụọ Nsọ gị duzie m kwa ụbọchị. Nyere m aka ka m hụ Gị n’anya site n’obi m niile, mkpụrụobi m niile, na uche m niile, ma ka m hụ ndị ọzọ n’anya dị ka onwe m. Daalụ maka ịzọpụta m site n’ọbara Ọkpara Gị, Jizọs. N’aha Jizọs ka m kpere ekpere. Amen.




